2ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.
3Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla
4ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.
5Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.
6Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ.