Diuteronomi 21

Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

Deuteronomy 21:9 (UKJV) So shall you put away the guilt of innocent blood from among you, when you shall do that which is right in the sight of the LORD.

7Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya.

8Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ.

9Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

10Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,

11ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.