10Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
11Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.
12Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.
13Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ,
14ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ,