Diuteronomi 22

ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.

Deuteronomy 22:24 (UKJV) Then all of you shall bring them both out unto the gate of that city, and all of you shall stone them with stones that they die; the damsel, because she cried not, being in the city; and the man, because he has humbled his neighbour's wife: so you shall put away evil from among you.

22Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.

23Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,

24ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.

25Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.

26Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.