24ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.
25Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.
26Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya.
27A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.
28Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa,