Diuteronomi 23

Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,

Deuteronomy 23:15 (UKJV) You shall not deliver unto his master the servant which is escaped from his master unto you:

13Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.

14Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.

15Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,

16hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.

17Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.