15Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,
16hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.
17Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.
18Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
19A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.