1Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
2Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
3Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.
4Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.