Diuteronomi 23

Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.

Deuteronomy 23:3 (UKJV) An Ammonite or Moabite shall not enter into the congregation of the LORD; even to their tenth generation shall they not enter into the congregation of the LORD for ever:

1Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.

2Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.

3Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.

4Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.

5Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.