19A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.
20Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta.
21Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya.
22Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!
23Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.