7Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha.
8Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke Onyenwe anyị.
9Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.
10Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
11Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.