9Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.
10Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
11Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.
12Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
13Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.