10Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.
11Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.
12Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
13Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume.
14Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.