Diuteronomi 24

Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.

Deuteronomy 24:10 (UKJV) When you do lend your brother any thing, you shall not go into his house to fetch his pledge.

8Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.

9Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.

10Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.

11Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.

12Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.