20Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.
21Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
22Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.