Diuteronomi 25

Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.

Deuteronomy 25:1 (UKJV) If there be a controversy between men, and they come unto judgment, that the judges may judge them; then they shall justify the righteous, and condemn the wicked.

1Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.

2Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya,

3ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.