Diuteronomi 25

A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”

Deuteronomy 25:10 (UKJV) And his name shall be called in Israel, The house of him that has his shoe loosed.

8Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,”

9nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.”

10A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”

11Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya,

12a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.