10A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”
11Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya,
12a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya.
13Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.
14Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta.