Diuteronomi 25

Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.

Deuteronomy 25:4 (UKJV) You shall not suppress the ox when he treads out the corn.

2Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya,

3ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.

4Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.

5Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa.

6Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.