Diuteronomi 25

Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.

Deuteronomy 25:6 (UKJV) And it shall be, that the firstborn which she bears shall succeed in the name of his brother which is dead, that his name be not put out of Israel.

4Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.

5Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa.

6Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.

7Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.”

8Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.