Diuteronomi 26

Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha.

Deuteronomy 26:12 (UKJV) When you have made an end of tithing all the tithes of yours increase the third year, which is the year of tithing, and have given it unto the Levite, the stranger, the fatherless, and the widow, that they may eat within your gates, and be filled;

10Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ.

11Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị.

12Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha.

13Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla.

14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.