17“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
18“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
19“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
20“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
21“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”