Diuteronomi 27

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Deuteronomy 27:21 (UKJV) Cursed be he that lies with any manner of beast. And all the people shall say, Amen.

19“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

20“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

21“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

22“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

23“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.