1Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
2Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
3Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
4Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.