4Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
5Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
6Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
7Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
8Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”