14Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
15Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
16Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi,
17Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
18Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.