17Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
18Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.
19Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
20Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.
21Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.