55Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere.
56Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,
57ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.
58Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
59Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.