57ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.
58Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
59Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.
60Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.
61Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.