Diuteronomi 28

Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.

Deuteronomy 28:60 (UKJV) Moreover he will bring upon you all the diseases of Egypt, which you were afraid of; and they shall cleave unto you.

58Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,

59Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.

60Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.

61Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.

62Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.