Diuteronomi 28

Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.

Deuteronomy 28:62 (UKJV) And all of you shall be left few in number, whereas all of you were as the stars of heaven for multitude; because you would not obey the voice of the LORD your God.

60Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.

61Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.

62Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.

63Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị.

64Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.