Diuteronomi 28

Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka.

Deuteronomy 28:66 (UKJV) And your life shall hang in doubt before you; and you shall fear day and night, and shall have none assurance of your life:

64Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ.

65Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba.

66Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka.

67Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.

68Onyenwe anyị ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.