5Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
6Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ.
7Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
8Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
9Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.