21Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
22Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya.
23Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
24Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”
25Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.