2Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.
3Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.
4Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
5Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.
6Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”