18Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.
19Otu ọ dị, ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ, ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu ga-ebi nʼobodo ndị m nyere unu, lekọtaa anụ ụlọ unu anya,
20tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.”
21Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga.
22Atụla ha egwu, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.”