27Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
28Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.”
29Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.