Diuteronomi 4

Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.

Deuteronomy 4:1 (UKJV) Now therefore hearken, O Israel, unto the statutes and unto the judgments, which I teach you, in order to do them, that all of you may live, and go in and possess the land which the LORD God of your fathers gives you.

1Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.

2Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.

3Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.