Diuteronomi 4

Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.

Deuteronomy 4:3 (UKJV) Your eyes have seen what the LORD did because of Baalpeor: for all the men that followed Baalpeor, the LORD your God has destroyed them from among you.

1Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.

2Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.

3Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.

4Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.

5Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.