Diuteronomi 4

Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.

Deuteronomy 4:5 (UKJV) Behold, I have taught you statutes and judgments, even as the LORD my God commanded me, that all of you should do so in the land where all of you go to possess it.

3Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.

4Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.

5Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.

6Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”

7Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.