12Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”
13Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?”
14Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.
15Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi.
16Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.