10Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
11Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime.
12Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”
13Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?”
14Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.