16Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
17Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha,
18agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
19Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ
20ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.