8Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
9Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.
10Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu,
11mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya.
12Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a.