11mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya.
12Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a.
13Ụmụntakịrị ha, ndị na-amabeghị iwu ndị a, aghaghị ịnụ na ịmụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, ụbọchị ndụ unu niile nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”
14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Lee, ụbọchị ọnwụ gị na-abịaru nso. Kpọrọ Joshua ka gị na ya soro bịa nʼụlọ nzute ebe m ga-anọ nye ya ọrụ ọ ga-arụ.” Mosis na Joshua sooro bịa guzo onwe ha nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.