Diuteronomi 31

Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.

Deuteronomy 31:18 (UKJV) And I will surely hide my face in that day for all the evils which they shall have wrought, in that they are turned unto other gods.

16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara.

17Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’

18Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.

19“Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha.

20Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.