18Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.
19“Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha.
20Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.
21Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.”
22Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel.