Diuteronomi 31

Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.

Deuteronomy 31:28 (UKJV) Gather unto me all the elders of your tribes, and your officers, that I may speak these words in their ears, and call heaven and earth to record against them.

26“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu.

27Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ?

28Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.

29Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu Onyenwe anyị nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.”

30Ya mere, Mosis gụpụtara okwu niile dị nʼabụ a site na mbido ruo ọgwụgwụ na ntị nzukọ ndị Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.