24Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ,
25o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,
26“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu.
27Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ?
28Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.