Diuteronomi 32

na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.

Deuteronomy 32:14 (UKJV) Butter of cattle, and milk of sheep, with fat of lambs, and rams of the breed of Bashan, and goats, with the fat of kidneys of wheat; and you did drink the pure blood of the grape.

12Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.

13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,

14na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.

15Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya, ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya. Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya, jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya.

16Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.